ABÙ ỌMA 22:1-8
ABÙ ỌMA 22:1-8 Bible Nso (IGBOB)
Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya? Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere. Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze. Na Gi ka nna-ayi-hà tukwasiri obi: Ha tukwasiri obi, I we me ka ha b͕apu. Gi ka ha tikuru, eme-kwa-ra ka ha wepuga onwe-ha: Na Gi ka ha tukwasiri obi, ihere emeghi kwa ha. Ma mu onwem bu idide, ọ bughi kwa madu ka m'bu; Abum ihe-ita-uta nke mmadu, na onye ndim neleda anya. Ndi nile ndi nāhum nāchìm ọchi: Ha na-enu ọnu, fufè isi, si, Turu onwe-gi rue Jehova aru; Ya me ka ọ b͕apu: Ya naputa ya, n'ihi na ihe-ya atọwo Ya utọ.
ABÙ ỌMA 22:1-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile? O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere. Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel. Nna anyị ha tụkwasịrị gị obi; ha tụkwasịrị gị obi, ị zọpụtakwara ha. Ha kpọkuru gị si otu a bụrụ ndị a zọpụtara; ihere emeghị ha nʼihi na ha tụkwasịrị gị obi. Abụ m idide, abụghị m mmadụ; onye ndị ọzọ na-akwa emo, onye ndị mmadụ na-eleda anya. Ndị niile hụrụ m na-achị m ọchị; na-emiri m ọnụ ịkwa emo, na-efufekwa isi ha na-asị. “O na-atụkwasị ONYENWE ANYị obi; ka ONYENWE ANYị bịa gbapụta ya. Ya napụta ya ebe ọ bụ na ihe ya masịrị ya.”