ABÙ ỌMA 22:1-3
ABÙ ỌMA 22:1-3 Bible Nso (IGBOB)
Chinekem, Chinekem, n'ìhi gini ka I rapurum? N'ìhi gini ka I nọ m n'ebe di nzọputam na okwu nile nke ọb͕ub͕ọ-ujam anya? Chinekem, anamakpọ òkù n'ehihie, ma I dighi-aza; N'abali kwa, ma ọ dighi inọ-jū m'nwere. Ma Gi onwe-gi di nsọ, Gi Onye nānọkwasi n'otuto nile nke Israel dika oche-eze.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 22ABÙ ỌMA 22:1-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke m, Chineke m, gịnị mere i jiri hapụ m? Gịnị mere i ji nọ ebe dị anya ịzọpụta m, nʼebe dị anya site nʼịsụ ude m niile? O Chineke m, ana m akpọku gị nʼehihie, ma ị dịghị aza m, nʼabalị kwa, ma ọ dịghị izuike m nwere. Nʼezie, i nọ nʼocheeze gị dịka Onye ahụ dị Nsọ; ị bụ otuto ndị Izrel.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 22