ABÙ ỌMA 20:1-9
ABÙ ỌMA 20:1-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ka ONYENWE ANYị zaa gị nʼụbọchị nsogbu gị; ka aha Chineke nke Jekọb chebe gị. Ya sitekwa nʼebe nsọ ya zitere gị inyeaka, ma site na Zayọn kwagide gị. Ya chetakwa aja niile ị chụrụ, ma nabata aja nsure ọkụ niile ị chụrụ nye ya. Sela Ya mezukwara gị ihe niile nke obi gị na-achọ, mekwaa ka atụmatụ gị niile gaa nke ọma. Anyị ga-eti mkpu ọṅụ maka mmeri i meriri, buliekwa ọkọlọtọ anyị elu nʼaha Chineke anyị. Ka ONYENWE ANYị mezuo arịrịọ gị niile. Ugbu a, amaara m na ONYENWE ANYị na-azọpụta onye ya o tere mmanụ; ọ na-esite nʼebe nsọ ya nʼeluigwe jiri aka nri ya, zọpụta ma zakwaa ya. Ụfọdụ na-atụkwasị obi ha na ịnyịnya, ndị ọzọ nʼụgbọ agha; ma anyị na-atụkwasị aha ONYENWE ANYị, Chineke anyị, obi. Ha na-egbu ikpere nʼala ma daa, ma anyị ga-ebili, kwụrụ chịm. O ONYENWE ANYị, zọpụta eze! Zakwaa anyị mgbe anyị kpọkuru gị!
ABÙ ỌMA 20:1-9 Bible Nso (IGBOB)
Jehova za gi n'ubọchi nkpà, Aha Chineke nke Jekob me ka i nọ n'elu; Si n'ebe nsọ Ya zìe iye-aka-gi, Si kwa na Zaion kwagide gi; Ya cheta onyinye-gi nile i nyeworo inata iru-ọma, Ya nara kwa àjà-nsure-ọku-gi dika abuba; Selah Ya nye gi dika obi-gi si acho, Mezu kwa ndum-ọdu-gi nile. Ayi gēti nkpu ọṅù na nzọputa-Gi, Ọ bu kwa n'aha Chineke-ayi ka ayi gākwuba ọkọlọtọ-ayi nelu: Jehova mezue aririọ-gi nile. Ub͕u a ka m'maworo na Jehova azọputawo onye nke Ya etere manu; O gēji idi-ike nke nzọputa nke aka-nri-Ya Za ya site nelu-igwe-Ya di nsọ. Ufọdu nēhota ub͕o-ala, ndi ọzọ inyinya: Ma ayi onwe-ayi nēhota aha Jehova, bú Chineke-ayi. Ndi ahu eruruwo ala, da kwa ada: Ma ayi onwe-ayi ebiliwo, we guzo onwe-ayi ọtọ. Jehova, zọputa eze: Ya za ayi n'ubọchi ayi kpọkuru Ya.