ABÙ ỌMA 19:7-8
ABÙ ỌMA 19:7-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Iwu ONYENWE ANYị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ ONYENWE ANYị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Iwu ONYENWE ANYị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu ONYENWE ANYị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 19