ABÙ ỌMA 19:7-12
ABÙ ỌMA 19:7-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Iwu ONYENWE ANYị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ ONYENWE ANYị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Iwu ONYENWE ANYị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu ONYENWE ANYị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke ONYENWE ANYị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ. Ọ bụ site na ha ka a na-adọ ohu gị aka na ntị; ụgwọ ọrụ dị ukwuu dị nʼidebe ha. Onye pụrụ ịghọta amaghị ama ya niile? Gbaghara m ihe niile zoro ezo nke adịghị ike m.
ABÙ ỌMA 19:7-12 Bible Nso (IGBOB)
Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe. Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu: Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè. Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù. Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi. Ọzọ, eji ha dọ orù-Gi aka na nti: N'idebe ha ka ọkpukpu-ọlu riri nne nāputa. Nmehie emehieworo n'amaghi-ama, ònye ga-agbaghara ha? Guam n'onye ikpe ihe-nzuzo nile nāmaghi.