ABÙ ỌMA 19:1-4
ABÙ ỌMA 19:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ.
ABÙ ỌMA 19:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi. Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba, Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma. Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di; Anughi olu-ha. N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue, Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha.