ABÙ ỌMA 19:1-10
ABÙ ỌMA 19:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Eluigwe na-ezipụta ebube Chineke; mbara eluigwe na-egosikwa ọrụ aka ya. Ụbọchị niile, ha na-ekwupụta okwu, ehihie na abalị, ha na-egosipụta ihe ọmụma. Ha nweghị asụsụ, ha nweghị okwu, ma a na-anụ ụda ha. Nʼụwa niile ka olu ha na-apụ gazuo, okwu ọnụ ha niile erukwaala nʼebe ụwa sọtụrụ. Ọ bụ na mbara eluigwe ka Chineke maara ụlọ ikwu nye anyanwụ. Ọ dị ka nwokorobịa lụrụ nwunye ọhụrụ mgbe o si nʼụlọ ndina ya na-apụta, dịka ọgba ọsọ nke ọ na-anụ ọkụ nʼobi ịgba ọsọ ịsọ mpi. Ọ na-esite nʼotu nsọtụ nke mbara eluigwe, bido ije ya, gafee ruo na nsọtụ nke ọzọ. Ọ dịkwaghị ihe ọbụla na-ezonarị onwe ya site nʼokpomọkụ ya. Iwu ONYENWE ANYị zuruoke; ọ na-eweghachi mkpụrụobi. Ụkpụrụ ONYENWE ANYị niile kwesiri ntụkwasị obi; ọ na-eme ka onye na-enweghị uche mara ihe. Iwu ONYENWE ANYị ziri ezi, ọ na-enye mkpụrụobi ọṅụ. Iwu ONYENWE ANYị na-amụke amụke, ọ na-enye anya ìhè. Ịtụ egwu ONYENWE ANYị dị ọcha, ọ na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ụkpụrụ niile nke ONYENWE ANYị na-eguzosi ike, ha niile bụkwa ihe ziri ezi. Ha dị oke ọnụ karịa ọlaedo, karịa ọlaedo a nụchara anụcha; ha na-atọkwa ụtọ karịa mmanụ aṅụ, karịa mmanụ aṅụ si nʼụbụbọ aṅụ.
ABÙ ỌMA 19:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Elu-igwe nākọ nsọpuru Chineke; Ọ bu kwa ọlu aka-Ya ka mbara elu-igwe nēgosi. Otu ubochi na-agwa ubochi-ibe-ya okwu-onu nuba, Otu abali nekwuputa-kwa-ra abali-ibe-ya ihe-omuma. Okwu-ọnu adighi, ọ dighi kwa okwu di; Anughi olu-ha. N'uwa nile ka eriri-ọtùtù-ha puworo jezue, Na nsọtu elu-uwa dum madu bi ka okwu-ha puwo-kwa-ra jezue. O doworo anyanwu ulo-ikwū nime ha. Anyanwu ahu di kwa ka nwoke nālu nwunye ọhu nke nēsi n'ulo-ndina-ya puta, Obi nātọ ya utọ dika nwoke di ike ib͕aso uzọ-ya. Site n'otù nsọtu elu-igwe ka nputa-ya di, Ib͕a-buruburu-ya diru kwa nsọtu-ya nile: Ọ dighi kwa ihe ezonarioworo okpom-ọku-ya. Iwu Jehova zuru okè, nēweghachi nkpuru-obi: Ihe-àmà Jehova kwesiri ntukwasi-obi, nēme ka onye nēnweghi uche mara ihe. Ukpuru nile Jehova tọrọ ziri ezi, nēme ka obi ṅuria ọṅu: Ihe Jehova nyere n'iwu nēnwu enwu, nēnye anya ìhè. Egwu Jehova di ọcha, nēguzo rue mb͕e ebighi-ebi: Ikpé nile nke Jehova bu ezi-okwu, ha nile ziri ezi n'otù. Ihe anāchọsi ike ka ha bu, kari ọla-edo, e, kari ọtutu ọla-edo anuchara anucha: Ha di kwa utọ kari manu-aṅu bú nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu nātasi.