ABÙ ỌMA 18:7-15
ABÙ ỌMA 18:7-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ụwa mere mkpọtụ, maa jijiji, ntọala niile nke ugwu niile makwara jijiji, ha mara jijiji nʼihi iwe nke na-ewe ya. Anwụrụ ọkụ sitere ya nʼimi pụta, ọkụ na-erepịa erepịa sikwa nʼọnụ ya pụta; icheku ọkụ na-ere ọkụ sitekwara nʼebe ahụ nwupụta. O kewara mbara eluigwe, rịdata; oke igwe ojii dịkwa nʼokpuru ụkwụ ya. Ọ nọkwasịrị nʼelu cherubim felie elu, o feliri elu nʼelu nku nke ifufe. O mere ọchịchịrị ebe nzuzo ya, ihe mkpuchi nke gbara ya gburugburu, bụ ọchịchịrị mmiri igwe ojii nke mbara eluigwe. Site nʼìhè nke na-enwupụta nʼahụ ya, igwe ojii ji mkpụrụ mmiri na amụma egbe eluigwe gabiga. ONYENWE ANYị sitere nʼeluigwe bigbọọ; olu Onye kachasị ihe niile elu dara ụda. Ọ gbara àkụ ya, mee ka ndị iro gbasasịa, o jikwa oke amụma nke egbe eluigwe chụsaa ha. E kpughere ala ala nke oke osimiri, gbakwa ntọala niile nke ụwa ọtọ, site nʼịba mba gị, O ONYENWE ANYị, na nkuume si gị nʼimi pụta.
ABÙ ỌMA 18:7-15 Bible Nso (IGBOB)
Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya. O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua. O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie: O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè. Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu; Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara, Akú-miri-ígwé na icheku ọku. Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku. O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha. Ewe hu ebe nile miri si erù, Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova, Site nume nke iku-ume nke imi-Gi.