ABÙ ỌMA 18:46-49
ABÙ ỌMA 18:46-49 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m, onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto.
ABÙ ỌMA 18:46-49 Bible Nso (IGBOB)
Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke nzọputam di kwa elu: Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, We duru ndi di iche iche bia n'okpurum. Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike. N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma.