ABÙ ỌMA 18:30-35
ABÙ ỌMA 18:30-35 Bible Nso (IGBOB)
Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam. O nēzi akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba.
ABÙ ỌMA 18:30-35 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ ONYENWE ANYị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu.