ABÙ ỌMA 18:25-50
ABÙ ỌMA 18:25-50 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ ONYENWE ANYị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ. Achụrụ m ndị iro m ọsọ, jidekwa ha; alaghachighị m azụ tutu ruo mgbe ha niile lara nʼiyi. Etidara m ha nʼala ebe ha enwekwaghị ike ibilite. Ha dara nʼokpuru ụkwụ m. Ọ bụ gị nyere m ike ibu agha, i wedara ndị niile na-emegide m nʼala nʼihu m. I mere ka ndị iro m tụgharịa gbapụ ọsọ. Ebibikwara m ndị kpọrọ m asị. Ha bere akwa maka enyemaka, ma ọ dịghị onye na-azọpụta ha. Ha kpọkuru ONYENWE ANYị, ma ọ zaghị ha. Egwepịara m ha nke ọma dịka ntụ nke ikuku na-ebufu; a zọtọrọ m ha dịka apịtị nke okporoụzọ. Ị napụtala m site nʼaka ndị na-alụso m ọgụ ị meela m onyeisi nke ọtụtụ mba; ndị m na-amaghị na mbụ na-ejekwara m ozi. Ndị ala ọzọ na-ehulata nʼihu m nʼihi egwu, ngwangwa ha nụrụ olu m, ha na-erube isi nye m. Obi na-ada ha mba; ha na-ama jijiji mgbe ha na-esite nʼebe niile ha e wusiri ike na-apụta. ONYENWE ANYị na-adị ndụ! Otuto dịrị oke nkume m! Mbuli elu dịrị Chineke, Onye nzọpụta m. Ọ bụ Chineke ahụ onye na-abọrọ m ọbọ, onye na-emekwa ka mba dị iche iche nọrọ nʼokpuru m, onye na-anapụta m site nʼaka ndị iro m. I mere ka m dị elu karịa ndị iro, napụtakwa m site nʼaka nwoke na-eme ihe ike. Nʼihi nke a, ONYENWE ANYị, aga m eto gị nʼetiti mba niile dị iche iche, aga m abụku aha gị abụ otuto. Ọ na-enye eze ya mmeri dị ukwuu; Ọ na-egosikwa onye ya onye e tere mmanụ ịhụnanya na-adịghị ada ada, nye Devid na ndị agbụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 18:25-50 Bible Nso (IGBOB)
N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere; N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á. N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala; Ma anya npako, I gēme ka ha di ala. N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe; Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi. Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè. O nēdozi ukwum ka ha di ka ukwu nne-ele: N'elu ebem di elu ka O nēguzokwam. O nēzi akam abua ibu agha; Ogwe-akam abua nārọgọ kwa uta ọla. I nyewokwam ọta nzọputa-Gi: Aka-nri-Gi nākwagidekwam, Ume-ala-n'obi nke Gi nēmekwam ka m'ba uba. I nēme ka nzọ-ukwum sa mbara n'okpurum, Nkwonkwo-ukwum ab͕uchapughi kwa. Anamachu ndi-irom, we rue ha aru: Adighm-alaghachi kwa rue mb͕e emere ka ha gwusia. Anam akwatu kwa ha, ha apughi kwa ibili ọzọ: Ha nāda n'okpuru ukwum abua. I nēji kwa ike kem dika ihe-ọkiké ibu agha: I nēme ka ndi nēbili imegidem ruru ala n'okpurum. Ndi-irom, I nyewokwam olu-ha Ndi nākpọm asì, anamekpochapu kwa ha. Ha nēti nkpu ka eyere ha aka, ma ọ dighi onye nāzọputa ha: Ha nētiku Jehova, ma Ọ zaghi ha. Anamasu kwa ha me ka ha di ka ájá n'iru ifufe: Dika apiti èzí ka m'nāwupu ha. I nēme ka m'b͕apu n'ilu-ọ̀gù nile nke ndim; I nēdom onye-isi mba nile ọzọ Ndi m'nāmaghi gēfèm òfùfè. Mb͕e ha nuru na nti ha nēgem nti: Ndi ala ọzọ nērube isi aghughọ n'okpurum. Ndi ala ọzọ nāta aru, Ma jijiji, si n'ebe-nmechibido-ha puta. Jehova nādi ndu; Onye agọziri agọzi ka oké nkumem bu kwa; Chineke nke nzọputam di kwa elu: Bú Chineke ahu Nke nābọrọm ọ́bọ̀, We duru ndi di iche iche bia n'okpurum. Ọ nēme ka m'baputa n'aka ndi-irom: I nēwelikwam elu kari ndi nēbili imegidem: I nānaputam n'aka madu nēme ihe-ike. N'ihi nka ka m'gēkele Gi, Jehova, n'etiti mba nile, Aha-Gi ka m'gābùku kwa abù ọma. Ọ nēme ka nzọputa eze-Ya di uku; Ọ nēme-kwa-ra onye nke Ya etere manu ebere, Bú Devid, Ọ nēme-kwa-ra nkpuru-ya ebere, rue mb͕e ebighi-ebi.