Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 18:25-36

ABÙ ỌMA 18:25-36 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼebe onye kwesiri ntụkwasị obi nọ, i na-egosi onwe gị onye kwesiri ntụkwasị obi, nʼebe onye zuruoke nọ, ị na-egosi onwe gị onye zuruoke. Nʼebe onye dị ọcha nọ, ị na-egosi onwe gị onye dị ọcha, ma nye ndị ụzọ ha na-ezighị ezi, ị na-egosi onwe gị dịka onye dị aghụghọ. Ị na-azọpụta ndị dị umeala nʼobi, ma ị na-eme ka ndị nwere anya mpako dị ala. Ọ bụ gị, ONYENWE ANYị, na-eme ka oriọna m na-enwu, Chineke m na-eme ka ọchịchịrị m ghọọ ìhè. Site nʼinyeaka gị, apụrụ m ịlụso igwe ndị agha ọgụ, sitekwa na Chineke m, apụkwara m ịwụfe mgbidi ọbụla. Ma banyere Chineke, ụzọ ya zuruoke, okwu ọnụ ONYENWE ANYị bụ ihe a nụchara anụcha; ọ bụ ọta nke onye ọbụla na-ezo onwe ya nʼokpuru ya. Nʼihi na onye bụ Chineke, ma ọ bụghị naanị ONYENWE ANYị? Onye bụkwa oke Nkume ahụ, ma ọ bụghị naanị Chineke anyị? Ọ bụ Chineke na-enye m ike, na-echebekwa ụzọ m nʼizuoke. Ọ na-eme ka ụkwụ m dị gara gara, dịka nke nne ele; Ọ na-emekwa ka m kwụrụ chịm nʼebe niile dị elu. Ọ na-azụ aka m abụọ ibu agha, ogwe aka m abụọ pụrụ ịrọji ụta bronz. Ị na-eme ka inyeaka nke nzọpụta gị bụrụ ọta m, aka nri gị na-akwagidekwa m, inyeaka gị emeela m ka m dị ukwuu. Ị na-edozi ụzọ sara mbara nye ụkwụ, ka nkwonkwo ụkwụ m ghara ịgbụchapụ.