ABÙ ỌMA 18:16-24
ABÙ ỌMA 18:16-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O sitere nʼelu setịpụ aka ya, jidesie m aka ike, ọ dọpụtara m site nʼogbu mmiri niile. Ọ napụtara m site nʼaka ndị iro m dị ike, bụ ndị kpọrọ m asị, ndị dịkwa ike karịa m. Ha guzogidere m nʼụbọchị ihe ndakwasị m, ma ONYENWE ANYị bụrụ m ihe ndabere. Ọ kpọpụtara m gaa nʼebe sara mbara, ọ napụtara m nʼihi na ihe m na-atọ ya ụtọ. ONYENWE ANYị mesoro m dịka ezi omume m si dị; ọ kwụghachiri m dịka ịdị ọcha nke aka m si dị. Nʼihi na edebezuola m ụzọ niile nke ONYENWE ANYị, ikpe amaghị m nʼihi ịgbakụta Chineke azụ. Iwu ya niile dị nʼihu m, esibekwaghị m nʼụkpụrụ ya wezuga onwe m. Abụ m onye na-enweghị ịta ụta nʼihu ya, edebekwara m onwe m pụọ na mmehie. ONYENWE ANYị kwụghachiri m dịka ezi omume m si dị, dịka ịdị ọcha nke aka m abụọ si dị nʼanya ya.
ABÙ ỌMA 18:16-24 Bible Nso (IGBOB)
O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere. O we me ka m'puta rue ebe sara mbara; Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ. Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ. N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova, Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum, Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di, Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di.