ABÙ ỌMA 17:6-12
ABÙ ỌMA 17:6-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m. Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha. Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị, site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m. Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ. Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala. Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu.
ABÙ ỌMA 17:6-12 Bible Nso (IGBOB)
Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke: Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum. Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime Gi Site n'iru ndi nēbili imegide ha. Debem dika nwa-anya-Gi, Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi, Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe, Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu. Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako. Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi: Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala. Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike, Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo.