ABÙ ỌMA 17:1-5
ABÙ ỌMA 17:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe. Ka ikpém si n'iru Gi puta; Anya-Gi nāhu izi-ezi. I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè. Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya. Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha.
ABÙ ỌMA 17:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ. Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi. Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị. Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị. Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya.