ABÙ ỌMA 17:1-15
ABÙ ỌMA 17:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, nụrụ arịrịọ m ziri ezi, nụrụkwa mkpu akwa m. Gee ntị nʼekpere m nʼihi na o siteghị nʼegbugbere ọnụ na-ekwu okwu aghụghọ. Ka mkpepụta m si nʼaka gị bịa; ka anya gị hụ ihe ziri ezi. Ọ bụ ezie na ị nyochaala obi m, i letala m nʼabalị, nwalekwaa m, ị ga-achọpụta na o nweghị ihe ọ ọjọọ bụla m zubere, na ọnụ m ekwuhiebeghị. Ndị mmadụ agbalịala inye m ngarị ma anaghị m ekwe ka mụ na ndị na-eme ihe ike nwee mmekọrịta nʼihi iwu sitere nʼegbugbere ọnụ gị. Nzọ ụkwụ m akpafubeghị site nʼụzọ gị, ụkwụ m agbụchapụghịkwa site nʼọnọdụ ya. Ana m akpọku gị, O Chineke, nʼihi na amaara m na ị ga-aza m; gee m ntị ma nụrụ ekpere m. Zipụta ịhụnanya gị dị oke ebube; gị onye na-eji aka nri gị dị ike azọpụta ndị niile gbabara na gị site nʼaka ndị iro ha. Chebe m dịka mkpụrụ anya gị; zoo m na ndo nke nku gị, site nʼaka ndị ajọ omume gbara m gburugburu, ọ bụladị ndị iro m, ndị chọrọ igbu m. Ha anaghị eme ebere, ha bụ ndị afọ tara mmiri, okwu ịnya isi juru ha ọnụ. Ha achọpụtala ebe m nọ, ugbu a, ha gbara m gburugburu, ha ji anya nkọ, jikerekwa ịtụ m nʼala. Ha ka ọdụm agụụ na-agụ nke zoro onwe ya nʼọhịa, dịka ọdụm dị ike na-eche ihe ọ ga-adọgbu. ONYENWE ANYị, bilie guzogide ha, tigbuo ha. Jiri mma agha gị zọpụta m site nʼaka ndị ajọ omume. O ONYENWE ANYị, zọpụta m site nʼaka ndị dị otu a, site nʼaka ndị ụgwọ ọrụ ha bụ nʼụwa a. Ka ihe ịkpakọbara debere ndị ajọ omume jupụta afọ ha, ka afọ jukwa ụmụ site nʼihe ndị a, ka ha hapụrụ ihe fọdụrụ nye ụmụntakịrị ha. Ma mụ onwe m ga-ahụ ihu gị site nʼezi omume; mgbe m ga-ebili, afọ ga-eju m nke ọma, nʼihi na aga m ahụ gị ihu na ihu.
ABÙ ỌMA 17:1-15 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, nuru ezi omume, ṅa nti n'iti-nkpum; Ge nti n'ekperem, nke m'nējighi eb͕ub͕ere-ọnu aghughọ kpe. Ka ikpém si n'iru Gi puta; Anya-Gi nāhu izi-ezi. I nwawo obim; I letawom n'abali; I nuchawom, ma I dighi-achọputa ihe; Ezubewom na ọnum agaghi-agabiga ókè. Ma ọlu madu, site n'okwu eb͕ub͕ere-onu-Gi Ka mu onwem leziworo uzọ nile nke onye nēme ihe-ike anya. Nzọ-ukwum nile ejidewo okporo-uzọ-Gi nile, Ewezugaghi ije-ukwum n'ọnọdu-ha. Mu onwem akpọkuwo Gi, n'ihi na I nāzam, Chineke: Tọrọm nti-Gi n'ala, nuru okwu-ọnum. Me ka ebere-Gi nile guzo iche, Gi Onye ji aka-nri-Gi azọputa ndi nab͕abà nime Gi Site n'iru ndi nēbili imegide ha. Debem dika nwa-anya-Gi, Zobem n'okpuru ǹdò nkù-Gi, Site n'iru ndi nēmebi iwu, ndi nāpunaram ihe, Bú ndi-irom nēmegide nkpuru-obim, ndi nāb͕am buruburu. Ha ekpuchiwo obi-ha mara abuba: Ha ejiwo ọnu-ha kwue okwu nime npako. Ub͕u a ha di ayi buruburu na nzọ-ukwu-ayi: Ha nēdo anya-ha ime ka ayi ruru ala. Oyiyi-ya di ka ọdum nke agu idọb͕u anu nāgusi ike, Na dika nwa-ọdum nke nānọdu n'ebe-nzuzo. Bilie, Jehova, Buru ya uzọ, me ka o ruru ala: Me ka nkpuru-obim b͕apu n'aka ndi nēmebi iwu site na mma-agha-Gi; N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru. Mu onwem, n'ezi omume ka m'gāhu iru-Gi: Ka afọ jum n'udi gi, mb͕e m'tetara.