ABÙ ỌMA 16:7-11
ABÙ ỌMA 16:7-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Aga m eto ONYENWE ANYị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. Ana m elekwasị ONYENWE ANYị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo. Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ, ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi hụ ire ure. I gosila m ụzọ ndụ; ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị; ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 16:7-11 Bible Nso (IGBOB)
M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu: Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile. Edowom Jehova n'irum mb͕e nile: N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum. N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù: Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi. N'ihi na I gaghi-arapuru ala-mọ nkpuru-obim; I gaghi-enye onye-ebere-Gi ka ọ hu nbibi. I gēme ka m'mara uzọ ndu: Ojuju-afọ ọṅù di n'iru Gi; E! utọ di iche iche di n'aka-nri-Gi ebighi-ebi.