ABÙ ỌMA 16:5-9
ABÙ ỌMA 16:5-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị, i nyeela m oke m na iko m; ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza. Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma; nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ. Aga m eto ONYENWE ANYị, onye na-adụ m ọdụ; ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme. Ana m elekwasị ONYENWE ANYị anya mgbe niile. Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji. Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ; aga m anọkwa nʼudo.
ABÙ ỌMA 16:5-9 Bible Nso (IGBOB)
Jehova bu òkè nke ihe m'ketara na ìkom: Gi onwe-gi nējide ihe rurum n'ife-nzà. Udọ̀-ọtùtù nile adaworom n'ebe di utọ; N'ezie ihe-nketam dim ezi nma. M'gāgọzi Jehova, Onye duworom ọdu: Ọzọ, akurum abua nādọm aka na nti n'abali nile. Edowom Jehova n'irum mb͕e nile: N'hi na Ọ nọ n'aka-nrim, agaghi-ewzugam n'ọnọdum. N'ihi nka obim aṅuriwo ọṅu, nsọpurum eteghariwo kwa egwú ọṅù: Ọzọ anu-arum gēbi na ntukwasi-obi.