ABÙ ỌMA 15:1-5
ABÙ ỌMA 15:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị, onye pụrụ ịnọgide nʼụlọnsọ ukwu gị? Onye pụrụ ibi nʼugwu nsọ gị? Onye na-ebi ndụ nke na-enweghị ịta ụta, onye na-arụ ọrụ ezi omume, onye na-ekwu eziokwu site nʼobi ya. Onye jụrụ ikwutọsị ndị ọzọ, onye na-adịghị eme onye agbataobi ya ihe ọjọọ, na onye na-adịghị ekwulu mmadụ ibe ya, onye na-eleda onye ajọ omume anya, ma na-asọpụrụ ndị ahụ na-atụ egwu ONYENWE ANYị, onye na-adịghị agbanwe nkwa ọbụla o kwere, ọ bụladị mgbe nkwa ahụ na-emegide ya, onye na-agbazinye mmadụ ego na-anaghị ụma, onye na-adịghị a nara ngarị imegide onye aka ya dị ọcha.
ABÙ ỌMA 15:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, ònye gānọ dika ọbìa n'ulo-ikwu-Gi? Ònye gēbi n'ugwu nsọ Gi? Onye nēje ije n'izu-okè, nke nālu kwa ọlu ezi omume, Nke nēkwu kwa ezi-okwu n'obi-ya. O jighi ire-ya kwue okwu-azu, Ọ meghi madu-ibe-ya ihe ọjọ, O bulighi kwa ita-uta megide onye-ab͕ata-obi-ya. Eledawo onye ajuru aju anya n'anya-ya, Ma ndi nātu egwu Jehova ka ọ nā-asọputu. Ọ ṅuwo iyi nke gēmejọ ya onwe-ya, ma ọ dighi-ab͕anwe okwu-ya. Ọ nyeghi ego-ya inara uma, Ọ naraghi kwa ihe-iri-ngo megide onye nēmeghi ihe ọjọ. Onye nēme ihe ndia, agaghi-ewezuga ya n'ọnọdu-ya rue mb͕e ebighi-ebi.