ABÙ ỌMA 148:1-6
ABÙ ỌMA 148:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị. Toonu ONYENWE ANYị site nʼeluigwe, toonu ya nʼebe niile kachasị elu. Toonu ya, ndị mmụọ ozi ya niile, toonu ya, unu usuu ndị agha ya niile. Toonu ya, anyanwụ na ọnwa toonu ya, kpakpando niile. Toonu ya, unu eluigwe kachasị elu na unu mmiri dị nʼelu mbara eluigwe. Ka ha niile too aha ONYENWE ANYị, nʼihi na ha niile malitere ịdị site nʼokwu ọnụ ya. O doro ha nʼọnọdụ ha ga-anọ ruo mgbe ebighị ebi; o nyere iwu nke a na-agaghị agabiga.
ABÙ ỌMA 148:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Tonu Ja. Tonu Jehova site n'elu-igwe: Tonu Ya n'ebe di elu. Tonu Ya, ndi-mọ-ozi-Ya nile: Tonu Ya, usu-ndi-agha-Ya nile. Tonu Ya, anyanwu na ọnwa: Tonu Ya, kpakpando nile nke ìhè. Tonu Ya, elu-igwe nke elu-igwe, Na miri nke di n'elu elu-igwe. Ka ha to aha Jehova: N'ihi na Ya onwe-ya nyere iwu, ewe kè ha. O we me ka ha guzo rue mb͕e nile ebighi-ebi: Ukpuru ka Ọ nyeworo nke na-agaghi agabiga.