ABÙ ỌMA 146:1-10
ABÙ ỌMA 146:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Toonu ONYENWE ANYị. O mkpụrụobi m, too ONYENWE ANYị. Aga m eto ONYENWE ANYị ogologo ndụ m niile; aga m abụ abụ otuto nye Chineke m mgbe m nọ na-adị ndụ. Atụkwasịla ụmụ eze obi gị, ndị bụ mmadụ efu na-apụghị ịzọpụta. Mgbe mmụọ ha pụrụ, ha na-alaghachi nʼaja; nʼụbọchị ahụ, atụmatụ ha na-aghọ ihe efu. Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, onye inyeaka ya bụ Chineke nke Jekọb, onye olileanya ya dị na ONYENWE ANYị, Chineke ya. Onye kere eluigwe na ụwa, na osimiri, na ihe niile dị nʼime ha, ONYENWE ANYị, onye ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-ekpe ikpe ziri ezi nye ndị a na-akpagbu na-enyekwa ndị agụụ na-agụ nri. ONYENWE ANYị na-eme ka ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ nwere onwe ha, ONYENWE ANYị na-emeghe anya ndị kpuru ìsì, ONYENWE ANYị na-akwagide ndị niile dara mba, ONYENWE ANYị hụrụ ndị ezi omume niile nʼanya. ONYENWE ANYị na-echebe ndị ọbịa, na-elekọtakwa ndị na-enweghị nna na ndị di ha nwụrụ anwụ, ma ọ na-eme ka ihe ghara ịgara ndị ajọ omume nke ọma. ONYENWE ANYị na-achị ruo ebighị ebi, Chineke gị, o Zayọn, site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ABÙ ỌMA 146:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Tonu Ja. Nkpuru-obim, to Jehova. M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu. Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere. Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta; N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì. Onye ihe nāgara nke-ọma ka onye ahu bu nke Chineke nke Jekob bu Onye nēyere ya aka, Nke olile-anya-ya dikwasi Jehova, bú Chineke-ya: Onye meworo elu-igwe na uwa, Na oké osimiri, na ihe nile nke di nime ha; Onye nēdebe ezi-okwu rue mb͕e ebighi-ebi: Onye nēmere ndi anēmeb͕u ihe O kpere n'ikpe; Onye nēnye ndi agu nāgu nri: Jehova nātọpu ndi-nkpọrọ; Jehova nēmeghe anya ndi-ìsì; Jehova nēkuli ndi nēruda n'ala; Jehova n'ahu ndi ezi omume n'anya; Jehova nēdebe ndi ala ọzọ; Nwa-nb͕ei na nwayi di-ya nwuru ka Ọ nēme ka ha guzo ọtọ; Ma uzọ ndi nēmebi iwu ka Ọ nēme ka ọ b͕agọ ab͕agọ. Jehova gābu eze rue mb͕e ebighi-ebi, Chineke-gi, Zaion, gābu eze rue ọb͕ọ nile. Tonu Ja.