Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 145:1-21

ABÙ ỌMA 145:1-21 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze; aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ụbọchị niile ka m ga-eto gị jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. ONYENWE ANYị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta. Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ; ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche. Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị, aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile. Ha ga-ekwupụta ihe banyere ike nke ọrụ ịtụnanya gị niile, aga m ekwusakwa ọrụ ukwuu gị niile. Ha ga-eme mmemme nʼihi ịdị mma gị dị ukwuu jirikwa ọṅụ bụọ abụ banyere ezi omume gị. ONYENWE ANYị na-eme amara nweekwa obi ọmịiko, ọ dịghị ewe iwe ọsịịsọ, ọ bara ụba nʼịhụnanya. ONYENWE ANYị dị mma nʼebe mmadụ niile dị; o nwere ọmịiko nʼebe ihe niile o kere eke dị. O ONYENWE ANYị, ihe niile i kere eke ga-eto gị; ndị nsọ gị na-aja gị mma. Ha ga-ekwupụta banyere ebube nke alaeze gị. Kwupụtakwa maka ịdị ike gị, ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị. Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. ONYENWE ANYị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. ONYENWE ANYị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba. Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru. I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ. Ụzọ ONYENWE ANYị niile ziri ezi; ọ na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya. ONYENWE ANYị na-anọ nso ndị niile na-akpọku ya, bụ ndị niile na-akpọku ya nʼeziokwu. Ọ na-emezu ọchịchọ niile nke ndị na-atụ egwu ya; ọ na-anụ akwa ha na-azọpụtakwa ha. ONYENWE ANYị na-echebe ndị niile hụrụ ya nʼanya, ma ọ ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi. Ọnụ m ga-ekwupụta otuto ONYENWE ANYị; ka ihe niile e kere eke too aha nsọ ya ruo mgbe ebighị ebi.

ABÙ ỌMA 145:1-21 Bible Nso (IGBOB)

M'gēme Gi ka I di elu, Chinekem, bú Eze; M'gāgọzi kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Kwa-ubọchi ka m'gāgọzi Gi; M'gēto kwa aha-Gi rue mb͕e nile ebighi-ebi. Onye uku ka Jehova bu, Ọ bu kwa onye anēto nke-uku; Ọ dighi kwa ngwuputa-ala diri idi-uku-Ya. Otù ọb͕ọ gāja ọlu-Gi nile na nti ọb͕ọ ọzọ, We gosi idi-ike-Gi nile. N'ima-nma nke nsọpuru nke ebube-Gi, Na n'oké ọlu-Gi nile, ka m'gātughari uche. Ọ bu kwa ike nke ọlu-Gi nile di egwu ka ha gēkwuputa; Ọ bu kwa idi-uku-Gi ka m'gākọ akukọ-ya. Ncheta nke iba-uba nke idi-nma-Gi ka ha ga-ekwukwa, Ọ bu kwa ezi omume-Gi ka ha gēti nkpu ọṅù bayere ya. Onye di amara na onye nwere obi-ebere ka Jehova bu; Ọ dighi-ewe iwe ọsọsọ, Ọ di kwa uku n'ebere. Jehova di nma n'ebe ihe nile ekère èkè di; Obi-ebere-Ya nile dikwasi kwa n'ọlu-Ya nile. Ọlu-Gi nile nēkele Gi, Jehova; Ndi-ebere-Gi nāgozi kwa Gi. Nsọpuru nke ala-eze-Gi ka ha nēkwuputa, Ọ bu idi-ike Gi ka ha nēkwu okwu bayere ya; Ime ka umu madu mara idi-ike-Ya nile, Na nsọpuru nke ima-nma nke ala-eze-Ya. Ala-eze-Gi bu ala-eze rue mb͕e nile ebighi-ebi, Ọchichi-Gi di kwa n'ọb͕ọ nile. Jehova nākwagide ndi nile nāda ada, O nēkuli kwa ndi nile nēruda n'ala. Anya ihe nile nēle anya Gi; Gi onwe-gi nēnye kwa ha ihe-oriri-ha na mb͕e-ya. I nāsaghe aka-Gi, I nēwere kwa ihe di ihe ọ bula di ndu utọ me ka afọ ju ya. Onye ezi omume ka Jehova bu n'uzọ-Ya nile, Ọ di kwa ebere n'ọlu-Ya nile. Jehova di nso ndi nile nākpọku Ya, Bú ndi nile nākpọku Ya n'ezi-okwu. Ihe di ndi nātu egwu Ya utọ ka Ọ gēme; Ọ bu kwa ntiku-ha ka Ọ gānu, we zọputa ha. Jehova nēdebe ndi nile nāhu Ya n'anya; Ma ndi nile nēmebi iwu ka Ọ gēkpochapu. Otuto Jehova ka ọnum gēkwu; Ka anu-aru nile gọzi kwa aha nsọ Ya rue mb͕e nile ebighi-ebi.