Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 144:1-15

ABÙ ỌMA 144:1-15 Bible Nso (IGBOB)

Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú oké nkumem, bu, Onye nēzí akam abua ilu ọ̀gù: Onye nēzí nkpisi-akam ibu agha: Eberem, na ebem ewusiri ike, Na ulo-elum, na onye m'nwere ime ka m'b͕apu; Na ọtam, na onye m'b͕abàworo nime ya; Onye nāzọda ndim n'okpurum. Jehova, gini ka madu bu, nke I nāmara ya? Na nwa nke madu, nke I nēchè èchìchè bayere ya? Madu yiri otù nku-ume Ubọchi-ya nile di ka onyinyo nāgabiga. Jehova, rulata elu-igwe-Gi, we rida: Metu ugwu aka, ha gākwu kwa anwuru-ọku. Me ka àmùmà b͕uputa, we me ka ha b͕asa; B͕apu àkú-Gi nile, we chusa ha. Si n'elu setipu aka-Gi; Dọputam, naputakwam n'ọtutu miri, N'aka ndi ala ọzọ; Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu, Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha. Chineke, abù ọhu ka m'gābùku Gi: Une nke akwara iri ka m'gēji bùkue Gi abù ọma. Ọ bu onye nēnye ndi-eze nzọputa: Onye nādọputa Devid, bú orù-Ya, n'ọnu mma-agha jọrọ njọ. Dọputam, nāputakwam n'aka ndi ala ọzọ, Ndi ọnu-ha kwuworo okwu efu, Aka-nri-ha bu kwa aka-nri ugha. Mb͕e umu-ayi ndikom di ka ihe akuru n'ala, ndi anēme ka ha bùe ibù mb͕e ha di na nwata; Umu-ayi ndinyom di ka ogidi nkuku ulo atuworo akika dika ihe-atù nke ulo uku; Ọba-ayi ejuwo, nēweputa ihe nile di iche iche; Igwè ewu na aturu nile ayi nāmuputa nnù abua na ọgu iri nnù abua na ọgu iri, orú nnù na nnù ise orú nnù na nnù ise, n'èzí nile ayi; Anēboju ehi nile ayi ibu nke-ọma; Ọ dighi nitpú di na mb͕idi-ayi, ọ dighi kwa ọpupu di, Ọ dighi kwa iti-nkpu di n'amá nile ayi; Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke di otú a: Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi ahu bu, nke Jehova bu Chineke-ha.

ABÙ ỌMA 144:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Otuto dịrị ONYENWE ANYị, onye bụ oke nkume m, onye na-ezi aka m abụọ ibu agha, na mkpịsịaka m ịlụ ọgụ. Ọ bụ Chineke m, onye jupụtara nʼịhụnanya, bụrụkwa ebe mgbaba m e wusiri ike, ebe m e wusiri ike na onye mgbapụta m, ọ bụ ọta m, onye m na-agbaba nʼime ya, onye ji aka ike mee ka ndị dị iche iche nọdụ nʼokpuru m. O ONYENWE ANYị, gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche echiche banyere ya, gịnị ka nwa nke mmadụ bụ ihe banyere ya ji na-emetụ gị nʼobi? Mmadụ dị ka otu nkuume; ụbọchị ndụ ya niile na-agafe ngwangwa dịka onyinyo. O ONYENWE ANYị, kewaa eluigwe rịdata; metụ ugwu niile aka ka ha kwụọ anwụrụ ọkụ. Zipụ amụma ka o chụsasịa ndị iro niile; gbaa ha àkụ gị niile ma chụsasịa ha. Site nʼelu setịpụ aka gị; gbapụta m, napụtakwa m site nʼoke osimiri, site nʼaka ndị si mba ọzọ, ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. O Chineke, aga m abụku gị abụ ọhụrụ. Une e ji akwara iri mee ka m ga-eji kpọọrọ gị egwu; gị onye na-enye ndị eze mmeri, onye na-agbapụta ohu ya Devid. Site na mma agha dị njọ gbapụta m; napụtakwa m site nʼaka ndị si mba ọzọ ndị ọnụ ha jupụtara nʼụgha, ndị aka nri ha jupụtakwara nʼaghụghọ. Mgbe ahụ, ụmụ ndị ikom anyị, nʼoge okorobịa ha, ga-adị ka ihe a kụrụ nʼala e lekọtara anya nke ọma, ụmụ anyị ndị inyom ga-adị ka ogidi a pịrị apị e ji achọ ụlọeze mma. Ọba anyị niile ga-ejupụta nʼihe oriri dị iche iche si nʼubi anyị. Atụrụ anyị ga-amụba nʼọtụtụ puku nʼọnụọgụgụ, ha ga-adị iri puku kwụrụ puku nʼubi anyị; igwe ehi anyị ga-adọkpụ ibu dị arọ. A gaghị enwe ntipu na mgbidi anyị niile, a gaghị adọta anyị nʼagha gaa obodo ọzọ, akwa ihe mgbu agaghị adị nʼokporoụzọ anyị niile. Ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị ihe ndị a dịịrị; ndị a gọziri agọzi ka ndị ahụ bụ, ndị Chineke bụ ONYENWE ANYị ha.