Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 143:1-12

ABÙ ỌMA 143:1-12 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

O ONYENWE ANYị, nụrụ ekpere m, gekwaa ntị nʼakwa arịrịọ m maka amara; nʼihi ikwesi ntụkwasị obi gị na ezi omume gị, bịa nyere m aka. Edubatala m nʼọnọdụ ikpe m ikpe, nʼihi na ọ dịghị onye ọbụla dị ndụ bụ onye ezi omume nʼihu gị. Onye iro na-achụ m ọsọ, ọ na-azọpịa ndụ m nʼala; na-emekwa ka m nọdụ nʼọchịchịrị, dịka ndị nwụrụ anwụ nʼogologo oge gara aga. Ya mere mmụọ m na-ada mba nʼime m ụjọ jupụtakwara m nʼobi. Ana m echeta ụbọchị niile ndị ahụ gara aga; ana m atụgharị uche nʼọrụ gị niile na-echekwa echiche banyere ihe niile aka gị rụrụ. Ana m agbasa aka m abụọ nye gị; agụụ gị na-agụ mkpụrụobi m dịka agụụ mmiri ozuzo si agụ ala kpọrọ nkụ. Sela O ONYENWE ANYị, zaa m ọsịịsọ; mmụọ m na-ada mba. Ezonarịla m ihu gị, ma ọ bụghị ya, aga m adị ka ndị na-arịda ruo nʼili. Mee ka m nụrụ okwu ịhụnanya gị nke na-adịghị agharịpụ nʼisi ụtụtụ, nʼihi na ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi. Zi m ụzọ m kwesiri ịgbaso, nʼihi na ọ bụ gị ka m na-eweli mkpụrụobi m nye. O ONYENWE ANYị, gbapụta m site nʼaka ndị iro m, nʼihi na ọ bụ nʼime gị ka m na-ezo onwe m. Kuziere m ime uche gị, nʼihi na ị bụ Chineke m; ka ezi Mmụọ gị duo m nʼala dị larịị. O ONYENWE ANYị, nʼihi aha gị chebe ndụ m; nʼime ezi omume gị, napụta m site na nsogbu. Nʼime ịhụnanya gị na-adịghị agharịpụ, kpochapụ ndị iro m; laa ndị niile kpọrọ m asị nʼiyi, nʼihi na abụ m ohu gị.