ABÙ ỌMA 141:1-10
ABÙ ỌMA 141:1-10 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ana m akpọku gị; bịakwute m ọsịịsọ. Nụrụ olu m mgbe m na-akpọku gị. Ka ekpere m bịa nʼihu gị dịka ihe na-esi isi ụtọ; ka nchili elu nke m chịlịri aka m abụọ dịrị ka aja a na-achụ nʼanyasị. Nyere m aka ka m mechie ọnụ m, o ONYENWE ANYị; na-echekwa egbugbere ọnụ m nche. Ekwela ka obi m nwee mmasị nʼihe ọjọọ, isonye ndị na-eme ihe ọjọọ rụọ ọrụ ajọ omume niile dị iche iche; ekwela ka m soro ha rikọọ ihe ụtọ ha niile. Ka onye ezi omume tie m ihe, nke a na-egosi obi ebere; ka ọ baara m mba, nke a bụ mmanụ nʼelu isi m. Isi m agaghị ajụ ya. Otu ọ dị, ekpere m na-emegide ọrụ niile nke ndị na-eme ihe ọjọọ. A ga-esite nʼelu nkume dị elu tụda ndị na-achị ha, mgbe ahụ, ndị ajọ omume ga-amata na okwu m niile bụ eziokwu. Ha ga-ekwu sị, “Dịka mmadụ na-egburi, na-akọgharị ala, otu a ka a ghasasịrị ọkpụkpụ anyị nʼọnụ ili.” Ma olileanya m dị na gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ ONYENWE ANYị nʼime gị ka m gbabara izere ndụ, ararala m nyefee nʼaka ọnwụ. Napụta m ka m ghara ịdaba nʼime ọnya igbudu niile nke ndị na-eme ajọ ihe siiri, sitekwa nʼọnya niile ha siiri m. Ka ndị ajọ omume daba nʼime ụgbụ ha, ma mụ onwe m ga-agabiga na-emerụghị ahụ ọbụla.
ABÙ ỌMA 141:1-10 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, akpọkuwom I; biakutem ọsọsọ: Ṅa nti olum, mb͕e m'kpọkuru Gi. Ka edozie ekperem dika ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'iru Gi; Ka nchili ọbu-akam buru onyinye-inata-iru-ọma nke anyasi. Jehova, Do nche n'iru ọnum; Chebe ọnu-uzọ eb͕ub͕ere-ọnum abua. Ewezugala obim ime ihe ọjọ, Iji nmebi-iwu nēme omume, Mu na madu ndi nālu ajọ ihe: Ekwe-kwa-la ka m'rie ihe ọ bula nihe-utọ n'ile ha. Ka onye ezi omume tib͕uem, ọ gābu ebere; Ya ba-kwa-ram nba, ọ gābu manu isi; Ekwela ka isim si, É-è: N'ihi na m'nọ nēkpe ekperem imegide ihe ọjọ ha nile. Atudawo ndi-ikpe-ha n'akuku nkume di elu; Ha gānu kwa okwu-ọnum nile; n'ihi na ha di utọ. Dika mb͕e madu nālu ọlu ubi we nēgwuwa ala, Otú a ka esesaworo ọkpukpu-ayi n'ọnu ala-mọ. N'ihi na ọ bu n'ebe I nọ, Jehova, Onye-nwe-ayi, ka anyam abua di: Nime Gi ka m'b͕abàworo; ab͕apula nkpuru-obim dika miri. Debem ka m'ghara idabà n'ib͕udu ha sirim, Na n'ọnyà ndi nālu ajọ ihe. Ka ndi nēmebi iwu dabà n'ub͕u nile nke aka ha n'otù n'otù, Rue mb͕e mu onwem gāgabiga.