ABÙ ỌMA 139:14-15
ABÙ ỌMA 139:14-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 139ABÙ ỌMA 139:14-15 Bible Nso (IGBOB)
M'gēkele Gi; n'ihi na ejiwo ihe di iche iche di egwu me ka m'buru oké ọlu: Oké ọlu ka ọlu-Gi nile di; Nkpuru-obim ma-kwa-ra ya nke-ọma. Ọkpukpum ezopughi n'anya-Gi, Mb͕e emerem na nzuzo, Mb͕e adurum nke-ọma, dika onye-ọ̀kà-ọdudu-ákwà si adu, n'ebe nile di ala nke uwa.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 139