Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 139:13-24

ABÙ ỌMA 139:13-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Ọ bụ gị kpụrụ akụkụ niile dị m nʼahụ. Ọ bụkwa gị jikọtara ha niile ka ha bụrụ otu mmadụ nʼime afọ nne m. Ana m eto gị nʼihi na abụ m onye e sitere nʼoke egwu na ebube kee; ọrụ gị niile dị ebube; amaara m nke a nke ọma. Ụdịdị m abụghị ihe zoro ezo nʼebe ị nọ mgbe a kpụrụ m nʼebe nzuzo ahụ, mgbe a kpakọtara m nʼebe omimi nke ụwa. Anya gị abụọ hụrụ ahụ m mgbe ọ na-enweghị ụdịdị ọbụla. E dere ụbọchị niile a kwadoro m nʼime akwụkwọ gị tupu otu nʼime ha adịrị. Lee ka echiche ị na-eche banyere m si dị oke ọnụahịa, o Chineke! Leekwa ka ha si dị ukwuu. Ọ bụrụ na m agụọ ha ọnụ, ha ga-adị ukwuu karịa ọnụọgụgụ aja dị nʼala. Mgbe m tetara, mụ na gị ka nọ. O Chineke, a sịkwarị na ị ga-ala ndị ajọ omume niile nʼiyi! Sitenụ nʼebe m nọ pụọ, unu ndị na-akwafu ọbara! Site nʼechiche ọjọọ, ha na-ekwu okwu banyere gị; ndị iro gị na-ekwutọ aha gị. O ONYENWE ANYị, ọ bụ na m akpọghị ha asị bụ ndị kpọrọ gị asị, na-asọkwa ndị na-enupu isi megide gị oyi? Ọ bụ naanị ịkpọ asị ka m nwere nʼebe ha nọ? Ana m agụnye ha dịka ndị iro m. O Chineke, nyochaa m, mara obi m. Nwaa m, matakwa echiche uche m niile. Chọpụta ma o nwere ihe ọjọọ dị nʼime m, ma duo m nʼụzọ ebighị ebi.