ABÙ ỌMA 139:1-6
ABÙ ỌMA 139:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya. N'azu na n'iru ka I nọchigideworom, we tukwasi ọbu-aka-Gi n'arum. Ọmuma-ihe di otú a dikaririm ebube; Ọ dika elu, apughm iru ya.
ABÙ ỌMA 139:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. O ONYENWE ANYị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya. Ị na-anọ m nʼihu, ma na-esokwa m nʼazụ, ị tụkwasịla m aka gị. Ihe ọmụma dị otu a dị oke omimi nye m, ọ dịkwa elu apụghị m iru ya.