ABÙ ỌMA 139:1-4
ABÙ ỌMA 139:1-4 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
O ONYENWE ANYị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile. Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile. O ONYENWE ANYị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 139ABÙ ỌMA 139:1-4 Bible Nso (IGBOB)
Jehova, I gwuputawo ala obim, I we maram. Gi onwe-gi amawo nnọdu-alam na nbili-ọtọm, I nāghọta èchìchèm nile site n'ebe di anya. Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma. N'ihi na ọ dighi okwu di n'irem, Ma, le, Jehova, I machasiwo ya.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 139