ABÙ ỌMA 135:5-7
ABÙ ỌMA 135:5-7 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na mu onwem amawo na Jehova di uku, Onye-nwe-ayi di kwa elu kari chi nile. Ihe nile nke tọrọ Jehova utọ, nke ahu ka O meworo, N'elu-igwe, na n'uwa, na n'oké osimiri nile, na ob͕u-miri nile. Ọ bu Onye nēme ka alulu si na nsọtu uwa kwugo; O meworo miri-ozuzo àmùmà; Ọ bu Onye nēme ka ifufe si n'ulo-nkwakọba-Ya nile puta.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 135ABÙ ỌMA 135:5-7 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Amaara m na ONYENWE ANYị dị ukwuu, na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile. ONYENWE ANYị na-eme ihe ọbụla masịrị ya nʼeluigwe na elu ụwa na nʼoke osimiri na nʼime ogbu mmiri niile. Ọ bụ ya na-eme ka igwe ojii na-apụta site nʼakụkụ niile nke ụwa. Ọ bụkwa ya na-ezite amụma nke na-eweta mmiri ozuzo. Ọ na-ewepụtakwa ifufe site nʼụlọ ifufe ya niile.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 135