ABÙ ỌMA 121:3-8
ABÙ ỌMA 121:3-8 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. ONYENWE ANYị na-eche gị nche, ONYENWE ANYị bụ ndo gị nʼaka nri gị; anyanwụ agaghị achagbu gị nʼehihie, ọnwa agaghị etigbukwa gị nʼabalị. ONYENWE ANYị ga-edebe gị ka ihe ọjọọ ọbụla ghara ịdakwasị gị. Ọ ga na-eche ndụ gị nche mgbe niile. ONYENWE ANYị ga-echebe gị mgbe ị na-apụ na mgbe ị na-abata abata, site ugbu a ruo mgbe niile ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 121:3-8 Bible Nso (IGBOB)
Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura. Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura, Bú Onye nēdebe Israel. Jehova bu Onye nēdebe gi: Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi. Anyanwu agaghi-etib͕u gi n'ehihie, Ọnwa agaghi-etib͕u kwa gi n'abali. Jehova gēdebe gi ka ihe ọjọ ọ bula ghara idakwasi gi; Ọ gēdebe nkpuru-obi-gi. Jehova gēdebe ọpupu-gi na nbata-gi, Site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi.