ABÙ ỌMA 121:2-5
ABÙ ỌMA 121:2-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Inyeaka m na-esite nʼaka ONYENWE ANYị, onye kere eluigwe na ụwa bịa. Ọ gaghị ekwe ka ụkwụ gị gbụchapụ, onye na-eche gị nche na-amụ anya oge niile; nʼezie onye na-eche Izrel nche adịghị arahụ ụra, ọ dịghị atụkwa oru ụra. ONYENWE ANYị na-eche gị nche, ONYENWE ANYị bụ ndo gị nʼaka nri gị
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 121ABÙ ỌMA 121:2-5 Bible Nso (IGBOB)
Iye-akam nēsi n'aka Jehova bia, Onye meworo elu-igwe na uwa. Ya ekwela ka ewezuga ukwu-gi n'ọnọdu-ya: Onye nēdebe gi, Ya atula òrù-ura. Le, Ọ dighi-atu òrù-ura, Ọ dighi-araru kwa ura, Bú Onye nēdebe Israel. Jehova bu Onye nēdebe gi: Jehova bu ǹdò-gi n'aka-nri-gi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 121