ABÙ ỌMA 118:5-9
ABÙ ỌMA 118:5-9 Bible Nso (IGBOB)
M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem? Jehova dirim n'etiti ndi nēyerem aka: Mu onwem gēlekwasi kwa ndi nākpọm asì. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi madu obi. Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 118ABÙ ỌMA 118:5-9 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m. ONYENWE ANYị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m? ONYENWE ANYị nọnyere m; ọ bụ onye na-enyere m aka. Aga m ele ndị iro m anya na mmeri. Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime ONYENWE ANYị karịa ịtụkwasị ụmụ mmadụ obi. Ọ kachasị mma ịgbaba nʼime ONYENWE ANYị karịa ịtụkwasị ndị amara aha ha obi.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 118