ABÙ ỌMA 118:15-24
ABÙ ỌMA 118:15-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri ONYENWE ANYị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu! Aka nri ONYENWE ANYị bụ ihe e weliri elu; aka nri ONYENWE ANYị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube ONYENWE ANYị rụrụ. ONYENWE ANYị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye ONYENWE ANYị ekele. Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ ONYENWE ANYị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye. Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m. Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; nke a bụ ọrụ aka ONYENWE ANYị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. Nke a bụ ụbọchị ONYENWE ANYị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya.
ABÙ ỌMA 118:15-24 Bible Nso (IGBOB)
Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja. Ja adọwom aka na nti nke-uku: Ma ọ bughi n'aka ọnwu ka O nyeworom. Megherenum ọnu-uzọ-ama nile nke ezi omume: M'gābà nime ha, m'gēkele Ja. Nka bu ọnu-uzọ-ama Jehova nwere; Ndi ezi omume gābà nime ya. M'gēkele Gi, n'ihi na I zawom, I we ghọrọm nzọputa. Nkume nke ndi nēwu ulo juru Aghọwo isi nkuku ulo. Ọ bu n'aka Jehova ka nka sitere; Nke ahu bu oké ọlu n'anya-ayi. Nka bu ubọchi Jehova meworo; Ayi gētegari egwú ọṅù, ṅuri kwa ọṅu nime ya.