Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 118:14-29

ABÙ ỌMA 118:14-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m. Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri ONYENWE ANYị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu! Aka nri ONYENWE ANYị bụ ihe e weliri elu; aka nri ONYENWE ANYị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube ONYENWE ANYị rụrụ. ONYENWE ANYị tara m ahụhụ nke ukwuu, ma o nyefeeghị m nʼaka ọnwụ. Megheere m ọnụ ụzọ ama nke ezi omume; aga m abanye nye ONYENWE ANYị ekele. Nke a bụ ọnụ ụzọ ụlọnsọ ONYENWE ANYị, ebe ndị ezi omume ga-esite na ya banye. Aga m enye gị ekele, nʼihi na ị zara m; ị ghọọla nzọpụta m. Nkume ahụ ndị na-ewu ụlọ jụrụ, aghọọla nkume isi ntọala ụlọ; nke a bụ ọrụ aka ONYENWE ANYị, ọ bụkwa ihe ịtụnanya nʼanya anyị. Nke a bụ ụbọchị ONYENWE ANYị anyị mere, ka anyị ṅụrịa ọṅụ, nweekwa obi ụtọ nʼime ya. O ONYENWE ANYị, zọpụta anyị; o ONYENWE ANYị, mee ka ihe gaara anyị nke ọma. Onye a gọziri agọzi ka onye ahụ bụ, nke na-abịa nʼaha ONYENWE ANYị. Anyị sitere nʼụlọ ONYENWE ANYị na-agọzi gị. ONYENWE ANYị bụ Chineke, ọ bụ ya mere ka ìhè ya mụkwasị anyị. Chịrị igu nkwụ nʼaka gị, soro ndị ji ọṅụ bata nʼogige Chineke bịaruo nʼebe ịchụ aja. Ị bụ Chineke m, aga m eto gị; ị bụ Chineke m, aga m ebuli gị elu. Keleenụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.