ABÙ ỌMA 118:14-17
ABÙ ỌMA 118:14-17 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
ONYENWE ANYị bụ ike m na abụ m; ọ ghọọla nzọpụta m. Olu iti mkpu ọṅụ na mmeri na-ada nʼime ụlọ ikwu ndị ezi omume: “Aka nri ONYENWE ANYị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu! Aka nri ONYENWE ANYị bụ ihe e weliri elu; aka nri ONYENWE ANYị emeela ọtụtụ ihe dị ukwuu!” Agaghị m anwụ, kama aga m adị ndụ kwusaara ndị ọzọ ọrụ ebube ONYENWE ANYị rụrụ.
ABÙ ỌMA 118:14-17 Bible Nso (IGBOB)
Ikem na abù ọmam ka Ja bu: Ọ ghọwo-kwa-ram nzọputa. Olu nke iti-nkpu-ọṅù na nzọputa di n'ulo-ikwū nile nke ndi ezi-omume: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. Ebuliwo aka-nri Jehova elu: Aka-nri Jehova nēme ihe dìnkpà. M'gaghi-anwu, kama m'gādi ndu, M'gākọ kwa akukọ ọlu nile nke Ja.