ABÙ ỌMA 118:1-6
ABÙ ỌMA 118:1-6 Bible Nso (IGBOB)
Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka Israel si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ulo Eron si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Biko, ka ndi nātu egwu Jehova si, Na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. M'siri na nkpàm kpọkue Ja; Ja zaram, me ka m'nọdu n'ebe sara mbara. Jehova dirim; m'gaghi-atu egwu: Gini ka madu gēmem?
ABÙ ỌMA 118:1-6 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Keleenụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ka ụmụ Izrel kwupụta nʼonwe ha sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ndị ezinaụlọ Erọn kwuokwa sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Ka ndị niile na-atụ egwu ONYENWE ANYị kwuo sị, “Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼọnọdụ oke ihe mgbu m, akpọkuru m ONYENWE ANYị, ọ zara m, mee ka m nwere onwe m. ONYENWE ANYị nọnyeere m, agaghị m atụ egwu. Gịnị ka mmadụ pụrụ ime m?