Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 107:1-43

ABÙ ỌMA 107:1-43 Bible Nso (IGBOB)

Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Ka ndi Jehova b͕aputaworo nāsi otú a, Bú ndi Ọ b͕aputaworo n'aka onye-nkpab͕u; O si-kwa-ra n'ala nile chikọputa ha, Site n'Iru-anyanwu na site n'Ọdida-anyanwu, Site n'Ugwu na site n'oké osimiri. Ha fughariri n'ọzara n'uzọ nke bu nání ala tọb͕ọrọ n'efu; Ọ dighi obodo obibi ha chọtara. Ndi agu nāgu na ndi akpiri nākpọ nku ka ha bu, Nkpuru-obi-ha adighi-enwe ike nime ha. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we naputa ha n'aka nkpà-ha nile. O me-kwa-ra ka ha zọ ije n'uzọ ziri ezi, Ijeru obodo obibi. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! N'ihi na O mewo ka afọ ju nkpuru-obi nāchọsi ihe ike, Ọ bu kwa nkpuru-obi agu nāgu ka O nyejuworo ezi ihe. Ndi nānọdu n'ọchichiri na onyinyo ọnwu, Bú ndi-nkpọrọ nke nweda-n'ala na ígwè; N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru okwu Chineke, Lelì kwa ndum-ọdu nke Onye kachasi ihe nile elu: O we me ka obi-ha ruru ala n'idọb͕u onwe-ha n'ọlu; Ha suru ngọngọ, ọ dighi kwa onye nēyere ha aka. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha n'aka nkpà-ha nile. O nēme ka ha si n'ọchichiri na onyinyo ọnwu puta, Ọ nētiji kwa ab͕u nile ha. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! N'ihi na O tipiawo ibo-ọnu-uzọ nile nke ọla, B͕uji kwa ihe-ntuchi nile nke ígwè. Ndi b͕agọrọ ab͕agọ n'uche neweda onwe-ha n'ala Site n'uzọ njehie-ha na site n'ajọ omume nile ha. Ihe-oriri nile ọ bula ka nkpuru-obi-ha nākpọ ihe-árú; Ha we biarue nso ọnu-uzọ-ama nile nke ọnwu. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, O we zọputa ha na nkpà-ha nile. O nēzite okwu-Ya, we me ka aru di ha nma, O nēme kwa ka ha si n'olùlù nile ha wepuga onwe-ha. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! Ka ha chu kwa àjà nile nke ekele, Were kwa iti-nkpu-ọṅù kọ akukọ ọlu-Ya nile. Ndi nārida n'oké osimiri n'ub͕o, Bú ndi nēje ozi n'ọtutu miri; Ndi ahu ahuwo ọlu nile nke Jehova, Na oké ọlu-Ya nile nime miri nke miri emi. N'ihi na Ọ nēkwu okwu, O we me ka oké ifufe guzo ọtọ, Nke nēbuli nmali-miri-ya nile elu. Ha nārigoru elu-igwe, ha nāridaru ob͕u-miri nile: Nkpuru-obi-ha nālọ miri site n'ọnọdu ọjọ ha. Ha nādaghari, nāṅaghari kwa dika onye ṅubigaworo manya ókè, Amam-ihe-ha nile nāla kwa n'iyì. Ha we tikue Jehova n'ahuhu diri ha, Ọ we me ka ha puta na nkpà-ha nile. Ọ nēme ka oké ifufe guzo n'idere du, Nmali-miri-ya nile we b͕a nkiti. Ha we ṅuria, n'ihi na ha nādaju; O we durue ha n'ótú nātọ ha utọ. Ka ha kele Jehova ekele bayere ebere-Ya, Na oké ọlu-Ya nile nke Ọ nāluru umu madu! Ka ha me kwa Ya ka Ọ di elu nime nkpọkọta ndi-Ya, Ka ha to kwa Ya nime nnọkọ ndi-okenye. O nēme ka osimiri ghọ ọzara, O nēme kwa ebe miri nāsuputa ka ha ghọ ala kpọro nku; Ala nke nāmi nkpuru ka ọ ghọ ala nnú nnú, Site n'ihe ọjọ nke ndi bi nime ya nēme. Ọ nēme ka ọzara ghọ ọdọ-miri juputara na miri, Ọ nēme kwa ka ala nke kpọrọ nku ghọ ebe miri nāsuputa. O we me ka ndi agu nāgu biri n'ebe ahu, Ha we dozie obodo obibi; Gha nkpuru n'ubi, kua ubi-vine di iche iche, Nweta nkepuru nke ihe-ọmume. Ọ nāgọzi kwa ha, ha we ba uba nke-uku; Ọ dighi-eme kwa ka anu-ulo-ha bilata. Ọzọ, ha nēbilata, we ruda n'ala, Site na nmeb͕u, na ihe ọjọ, na iru-újú. Ọ nāwusa nleda n'aru ndi amara aha-ha, We me ka ha kpafue nebe tọb͕ọrọ n'efu, ebe uzọ nādighi. Ọzọ, Ọ nēme ka ob͕eye si na nweda-n'ala nọ n'ebe di elu, Ọ nēme kwa ka ọ ghọ ab͕uru dika ìgwè ewu na aturu. Ndi ezi omume nāhu ya, we ṅuria; Ma ajọ omume nile ekpuchiwo ọnu-ya. Onye ọ bula nke mara ihe gāriba kwa ihe ndia ama, Ha gātukwasi kwa uche n'ebere nile nke Jehova.

ABÙ ỌMA 107:1-43 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Keleenụ ONYENWE ANYị, nʼihi na ọ dị mma; ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Ka ndị niile ONYENWE ANYị gbapụtara kwuo otu a, ndị niile ọ gbapụtara site nʼaka onye kpọrọ ha asị, ndị ọ kpọlatara site nʼala niile dị iche iche, site nʼọwụwa anyanwụ na ọdịda anyanwụ, site nʼugwu na ndịda. Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi. Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi. Mgbe ahụ, ha kpọkuru ONYENWE ANYị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile. O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi. Ka ha kelee ONYENWE ANYị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, nʼihi na o jirila ọtụtụ ezi ihe nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ meekwa ka onye akpịrị na-akpọ nkụ ṅụjuo afọ. Ụfọdụ nọdụrụ ala nʼọchịchịrị na nʼọnọdụ oke ihe mwute nke obi, ndị nọ nʼụlọ mkpọrọ na-ata ahụhụ ndị e ji mkpọrọ igwe kee ha agbụ, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu niile nke Chineke ma lelikwaa ndụmọdụ niile nke Onye kachasị ihe niile elu. Nʼihi ya, Chineke mere ka ha hụjuo anya site nʼịdọgbu onwe ha nʼọrụ, ha sụrụ ngọngọ daa, ma ọ dịghị onye ọbụla nyeere ha aka ibilite ọtọ. Mgbe ahụ, ha kpọkuru ONYENWE ANYị nʼime nsogbu ha, ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ha niile. O mere ka ha site nʼọchịchịrị na oke ihe mwute nke obi pụta. O tijikwara agbụ ha niile. Ka ha kelee ONYENWE ANYị nʼihi ịhụnanya ya, nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ, nʼihi na o tijisiela ọnụ ụzọ ama niile e ji bronz kpụọ gbujiekwa mkpọrọ ịkpọchi ụzọ niile e ji igwe kpụọ. Ụfọdụ ghọrọ ndị nzuzu site na nnupu isi taakwa ahụhụ nʼihi njehie ha niile. Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso. Mgbe ahụ, ha kpọkuru ONYENWE ANYị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile. O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha; ọ napụtara ha site nʼili. Ka ha kelee ONYENWE ANYị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ. Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile. Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri. Ha hụrụ ọrụ niile nke ONYENWE ANYị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri. Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu. Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri. Ha na-adagharị, na-aṅagharịkwa dịka ndị ṅụbigara mmanya oke. Mmụta ha banyere ịnya ụgbọ mmiri adịghị enyekwara ha aka nʼoge dị otu a. Mgbe ahụ, ha kpọkuru ONYENWE ANYị nʼime nsogbu ha, o mere ka ha pụta na mkpagbu ahụ niile. O mere ka oke ifufe dere duu; o mekwara ka ebili mmiri nke oke osimiri dajụọ. Ha ṅụrịrị ọṅụ mgbe ọ dajụrụ, o duuru ha ruo ebe ha na-aga nʼudo. Ka ha kelee ONYENWE ANYị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ. Ka ha bulie ya elu nʼetiti ọgbakọ ukwu ụmụ mmadụ ma tookwa ya na nzukọ ndị okenye. Ọ na-eme ka iyi ghọọ ọzara; na-emekwa ka ebe mmiri si asọpụta ghọọ ala kpọrọ nkụ. Ọ na-eme ka ala na-amị mkpụrụ hiri nne ghọọ ọzara, nʼihi ajọ omume nke ndị bi nʼime ya. Ọ na-eme ka ọzara ghọọ ala nke ọdọ mmiri jupụtara mee ka ala akọrọ ghọọ isi iyi nke na-asọ asọ; ebe ahụ ka ọ kpọbatara ndị agụụ na-agụ ka ha biri, ebe ahụ ka ha wuru obodo ebe ha ga-ebi. Ha ghara mkpụrụ nʼubi ha dị iche iche, kụọkwa ọtụtụ ubi vaịnị ndị mịrị mkpụrụ dị ukwuu; ọ gọziri ha, ọnụọgụgụ ha bakwara ụba, o mekwara ka anụ ụlọ ha mụbaa. Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ, ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala; onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị. Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ. Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ, ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu. Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a, ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya ONYENWE ANYị nke dị ukwuu.