ABÙ ỌMA 106:43-48
ABÙ ỌMA 106:43-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha. Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya; nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere. Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha. O ONYENWE ANYị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị. Otuto dịrị ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 106:43-48 Bible Nso (IGBOB)
Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha; Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha, Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha. O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha: O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha. Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi, Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nile Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ka ndi Israel nile si kwa, Amen. Tonu Ja.