ABÙ ỌMA 106:32-48
ABÙ ỌMA 106:32-48 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru ONYENWE ANYị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis; nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu. Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka ONYENWE ANYị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee. Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme. Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha. Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja. Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ. Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha. Nʼihi nke a, iwe were ONYENWE ANYị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ. Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha. Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha. Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha. Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya; nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere. Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha. O ONYENWE ANYị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị. Otuto dịrị ONYENWE ANYị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
ABÙ ỌMA 106:32-48 Bible Nso (IGBOB)
Ha kpasu-kwa-ra Ya iwe na miri Meriba, O we jọrọ Moses njọ n'ihi ha: N'ihi na ha nupuru isi n'okpuru Mọ-Ya, O we were eb͕ub͕ere-ọnu-ya abua kwue okwu efu. Ha ekpochapughi ndi di iche iche ahu, Dika Jehova siri ha; Ma ha gwakọtara onwe-ha na mba nile nke ala ahu, We muta ọlu nile ha: Ha we fè arusi nile ha òfùfè; Arusi ahu we ghọrọ ha ọnyà: Ọzọ, ha were umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom chuara ndi-mọ ọjọ àjà, We wusi ọbara nke nēmeghi ihe ọjọ, bú ọbara nke umu-ha ndikom na umu-ha ndinyom, Ndi ha were chuara arusi nile nke Kenean àjà; Ewe were ọbara merua ala ahu. Ewe were ọlu nile ha me ka ha buru ihe ruru árú, Ha we nākwa iko n'omume nile ha. Iwe Jehova we di ọku n'aru ndi-Ya, O we kpọ ihe-nketa-Ya ihe-árú. O we nye ha n'aka mba di iche iche; Ndi nākpọ ha asì we nāchi ha. Ndi-iro-ha meb͕u-kwa-ra ha, Ewe me ka ha ruru ala n'okpuru aka-ha. Ọtutu mb͕e ka Ọ nanaputa ha; Ma ha onwe-ha nānupu isi n'okpuru Chineke na ndum-ọdu-ha, Ewe kwada ha n'ajọ omume-ha. O we lekwasi ahuhu diri ha anya, Mb͕e Ọ nuru iti-nkpu-ha: O we cheta ọb͕ub͕a-ndu-Ya nye ha, We chègharia dika iba-uba nke ebere-Ya nile si di. O we me ha ka enwe obi-ebere nile n'aru ha N'iru ndi nile ndi nādọta ha n'agha. Zọputa ayi, Jehova, bú Chineke-ayi, Chikọputa kwa ayi n'etiti mba nile Ikele aha nsọ Gi, Na inya isi n'otuto-Gi. Onye agọziri agọzi ka Jehova, bú Chineke nke Israel, bu, Site na mb͕e ebighi-ebi we rue mb͕e ebighi-ebi. Ka ndi Israel nile si kwa, Amen. Tonu Ja.