ABÙ ỌMA 106:13-31
ABÙ ỌMA 106:13-31 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè. Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa. Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha. Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya. Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume. Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa. Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha. Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt, ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie. Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi. Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya. Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye ONYENWE ANYị. Nʼihi nke a, o weliri aka ya elu ṅụọrọ ha iyi na ọ ga-eme ka ha niile nwụọ nʼọzara, mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile. Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja; ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo ONYENWE ANYị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha. Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara. A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
ABÙ ỌMA 106:13-31 Bible Nso (IGBOB)
Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa; Ha echeghi ndum-ọdu-Ya: Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara, We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu. O we nye ha ihe ha riọrọ; Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha. Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova. Ala nēmeghe, we loda Detan, Kpuchi kwa nzukọ Abairam. Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha; Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu. Ha nēme nwa-ehi na Horeb, We kpọ isi ala nye ihe awuru awu. Ha we b͕anwe nsọpuru-ha N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala. Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt; Oké ọlu di iche iche n'ala Ham, Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie. O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi. Ọzọ, ha juru ala anāchọsi ike, Ha ekweghi okwu-Ya; Ha we tamu n'ulo-ikwū nile ha, Ha egeghi nti n'olu Jehova. O we welie aka-Ya elu n'ebe ha nọ, Ime ka ha da n'ọzara: Na ime ka nkpuru-ha da n'etiti mba nile, Na ichusa ha n'ala nile. Ha kekọta-kwa-ra onwe-ha n'aru Beal-peoa, We rie àjà nile nke ihe nwuru anwu. Ha we were omume nile ha kpasue Ya iwe: Ihe-otiti we dakwasi ha. Finehas wee guzo ọtọ, me ihe ekpere n'ikpe: Ewe b͕ochi ihe-otiti ahu. Ewe guara ya nka n'ezi omume, Rue ọb͕ọ nile rua mb͕e ebighi-ebi.