Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 106:1-23

ABÙ ỌMA 106:1-23 Bible Nso (IGBOB)

Tonu Ja. Kelenu Jehova; n'ihi na Ọ di nma: N'ihi na rue mb͕e ebighi-ebi ka ebere-Ya di. Ònye gākọ akukọ idi-ike nile nke Jehova? Ònye gēme ka anuru otuto-Ya nile? Ndi ihe nāgara nke-ọma ka ndi nēdebe ikpé bu, Ha na onye nēme ezi omume na mb͕e nile. Chetam, Jehova, were ka ihe ndi-gi si atọ Gi utọ chetam; Were nzọputa-Gi letam: Ka m'we lekwasi ọdi-nma nke ndi I rọputaworo, Ka m'we ṅuria n'ọṅù mba-Gi, Ka m'we soro ihe-nketa-Gi nya isi. Ayi esowo nna-ayi-hà mehie, Ayi emewo ajọ omume, ayi emebiwo iwu. Nna-ayi-hà enweghi uche ighọta oké ọlu-Gi nile n'Ijipt; Ha echetaghi iba-uba nke ebere-Gi nile; Ha we nupu isi n'akuku oké osimiri, bú n'Oké Osimiri Uhie. Ma Ọ zọputara ha n'ihi aha-Ya, Ime ka amara idi-ike-Ya. O we basiere Oké Osimiri Uhue nba, o we tasia: O we me ka ha nēje ije n'ob͕u-miri-ya nile dika ọ bu ọzara. O we zọputa ha n'aka onye nākpọ ha asì, B͕aputa kwa ha n'aka onye-iro-ha. Miri we kpuchie ndi nākpab͕u ha: Ọ dighi otù onye nime ha fọduru. Ha we kwere okwu-Ya nile; Ha nābù abù otuto-Ya. Ha chezọrọ ọlu-Ya nile ngwa ngwa; Ha echeghi ndum-ọdu-Ya: Ha we chọ ajọ ọchichọ n'ọzara, We nwa Chineke n'ala tọb͕ọrọ n'efu. O we nye ha ihe ha riọrọ; Ma O zitere aru-ọtita na nkpuru-obi-ha. Ha kwo-kwa-ra Moses ekworo n'ọmuma-ulo-ikwū-ha, Kwo kwa Eron, bú onye nsọ nke Jehova. Ala nēmeghe, we loda Detan, Kpuchi kwa nzukọ Abairam. Ọku we nēre n'etiti nzukọ-ha; Ire-ọku nērepia ndi nēmebi iwu. Ha nēme nwa-ehi na Horeb, We kpọ isi ala nye ihe awuru awu. Ha we b͕anwe nsọpuru-ha N'ihe-atù nke ehi nāta ihe akuru n'ala. Ha chezọrọ Chineke, bú Onye-nzọputa-ha, Onye nēmeri ihe uku di iche iche n'Ijipt; Oké ọlu di iche iche n'ala Ham, Na ihe di egwu di iche iche n'akuku Oké Osimiri Uhie. O we si na O gēkpochapu ha, Ma ọ buru na Moses, bú onye Ọ rọputaworo, eguzoghi na ntiwa ahu n'iru Ya, Ime ka ọnuma-Ya si n'ibibi ha laghachi.

ABÙ ỌMA 106:1-23 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Toonu ONYENWE ANYị. Keleenụ ONYENWE ANYị nʼihi na ọ dị mma; Ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi. Onye pụrụ ikwupụtasịcha ihe ukwu niile nke ONYENWE ANYị na-arụ maọbụ kwupụta otuto ya niile? Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ikpe ziri ezi, ndị ahụ na-eme ezi ihe mgbe niile. O ONYENWE ANYị, cheta m mgbe ị ga-egosi ndị gị ihuọma, bịa leta m, mgbe ị na-azọpụta ha, ka m soro keta oke na ngọzị ndị gị ị họpụtara, ka m keta oke nʼọṅụ ahụ dịrị mba gị sorokwa ihe nketa gị nye otuto. Anyị emehiela, dịka nna nna anyị ha mehiere; anyị emeela ihe ọjọọ, rụọkwa ọrụ ajọ omume. Mgbe nna nna anyị ha nọ nʼIjipt, ha echeghị uche banyere ọrụ ebube gị niile; ha echetakwaghị ịba ụba nke ebere gị niile, kama ha nupuru isi nʼakụkụ oke osimiri ahụ, bụ Osimiri Uhie. Ma ọ zọpụtara ha nʼihi aha ya, ime ka a mara ike ya dị ukwuu. Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara. Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha. Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ. Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto. Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè. Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa. Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha. Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị. Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya. Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume. Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa. Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha. Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt, ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie. Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.