Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 10:1-15

ABÙ ỌMA 10:1-15 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

ONYENWE ANYị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya? Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu? Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike, ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya. Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị ONYENWE ANYị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ. Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile. Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.” Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ, nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha. Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla, ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye. Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye. Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha. Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.” Bilie O ONYENWE ANYị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.

ABÙ ỌMA 10:1-15 Bible Nso (IGBOB)

Jehova, n'ìhi gini ka I nēguzo nēbe di anya? N'ìhi gini ka I nēzobe Onwe-gi na mb͕e nile nke nkpà? Site na npako nke onye nēmebi iwu ka anāchu onye ewedara n'ala ọku ọku; Anējide ha na nzube nile nke ha chère. N'ihi na onye nēmebi iwu anyawo isi n'ihe nkpuru-obi-ya nāchọsi ike, Onye nērita urù nēzighi ezi ka ọ gọziwo-kwa-ra, o lelìwo Jehova. Onye nēmebi iwu, ka imi-ya si di elu, nāsi, Ọ dighi ajuju Ọ gāju. Nzube-ya nile nāsi, ọ dighi Chineke ọ bula di. Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile; Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru: Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli. o siwo n'obi-ya, Agaghi-ewezugam n'ọnọdum: Rue ọb͕ọ nile ọ dighi mb͕e m'gānọ n'ọdi-njọ. Ọnu-ya juputara n'ọb͕ub͕a-iyi na aghughọ na mmegbu: N'okpuru ire-ya ka nmeb͕u na ajọ ihe di. Ọ nānọdu n'ebe iche-anwu nke obodo ntà nile: N'ebe-nzuzo nile ka ọ nēb͕u onye nēmeghi ihe ọjọ: Anya-ya abua nēwere nzuzo nyogide onye nāhuju anya. Ọ neche anwu n'ebe-nzuzo dika ọdum n'okwu-ọhia-ya: Ọ nēche anwu inwude onye ewedara n'ala: Ọ na-anwude onye ewedara n'ala, mb͕e ọ dọbatara ya n'ub͕u-ya. Anāzọpia ya, ọ nāmakpu amakpu, Ndi nāhuju anya adawo kwa n'ala site n'aka ndi-ya nwere ume. Ọ siwo n'obi-ya, Chineke echezọwo: O zobewo iru-Ya; ọ dighi mb͕e Ọ huru ya. Bilie, Jehova; Chineke, welie aka-Gi elu: Echezọla ndi ewedara n'ala. N'ìhi gini ka onye nēmebi iwu lelìworo Chineke? Ọ siwo n'obi-ya, I gaghi-aju ajuju. I huwo ya; n'ihi na Gi onwe-gi nēlegide nmeb͕u na nkpasu-iwe, itiye ya n'aka-Gi: N'aka-Gi ka onye nāhuju anya nārapu onwe-ya; Onye nēyere nwa-nb͕ei aka ka I buworo. Tijie ogwe-aka nke onye nēmebi iwu; Onye ọjọ kwa, I gājuta nmebi-iwu-ya rue mb͕e I gaghi-achọta ya.