ABÙ ỌMA 1:2-3
ABÙ ỌMA 1:2-3 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Kama ihe na-atọ ya ụtọ bụ ime ihe niile dị nʼiwu ONYENWE ANYị. Ọ na-atụgharịkwa uche ya nʼiwu ONYENWE ANYị ehihie na abalị, Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi, nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya, nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ. Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 1ABÙ ỌMA 1:2-3 Bible Nso (IGBOB)
Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali. Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma.
Kesaa
Gụọ ABÙ ỌMA 1