Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ILU 7:6-20

ILU 7:6-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya, hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ, ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme, nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi. Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya. (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya. Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.) O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị: “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m, Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa. Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa. Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m. Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya. O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”