ILU 7:6-20
ILU 7:6-20 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na na window nke ulom N'oghere-inara-ifufem ka m'lepuru anya; M'we hu n'etiti ndi nēnweghi uche, M'mata n'etiti umu-ndikom, Otù nwa-okorọbia nke obi amam-ihe kọrọ, Ka ọ nāgabiga n'amá na nso nkuku nwanyi ahu, Ọ bu kwa n'uzọ ulo-ya ka ọ nāzọ ije; Na chi-ojiji, n'anyasi nke ubọchi, Nime nb͕achi nke abali na ọchichiri. Ma, le, otù nwanyi zutere ya Yiri uwe nke nwanyi nākwa iko, ọ bu kwa onye echeworo obi-ya. Onye nēme nkpọtu ka ọ bu, buru kwa onye nēwezuga onwe-ya; Ọ bughi n'ulo-ya ka ukwu-ya nānọ: Ub͕u a n'èzí ka ọ nọ, ub͕u a ọ bu n'amá nile, Ọ bu kwa na nso nkuku nile ọ bula ka ọ nēche anwu. Nwanyi ahu we jide ya aka, sutu kwa ya ọnu, Were iru ihere nādighi si ya: Ihe àjà nile nke àjà-udo di n'akam; Ta ka m'kwughachiworo ihe nile m'kwere na nkwa. N'ihi nka ka m'putara izute gi, Ichọsi iru-gi ike, m'we chọputa gi. Ákwà-nb͕abá mara nma ka m'b͕abáworo n'ihe m'ji edina, Bú ákwà turu agwa nke ogho Ijipt. Ewerewom myrrh na aloes na cinnamon Fesa ihe-ndinam. Bia, ka afọ jubiga ayi ókè n'ikwa-iko rue ututu; Ka ayi me ka obi tọ ayi utọ n'ihu-n'anya nile. N'ihi na dim anọghi n'ulo, O jewo ije di anya: Ọ werewo akpa ego n'aka-ya; N'ubọchi ọnwa-ndọzu ka ọ gālata.
ILU 7:6-20 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na otu ụbọchị, esi m na oghereikuku dị nʼụlọ m lepụ anya, hụ nʼetiti ndị na-enweghị uche, ahụtara m otu nwokorobịa nʼetiti ha, onye amamihe kọrọ, ka ọ na-aga nʼụzọ dị nso ebe nkuku ụlọ nʼakụkụ ụlọ nwanyị ihere na-adịghị eme, nʼoge anyasị, dịka chi na-eji, mgbe ọchịchịrị na-agbachi. Mgbe ahụ, nwanyị ahụ pụtara zute ya. O yi uwe dịka nwanyị akwụna, jiri aghụghọ na-abịakwute ya. (Ọ na-eme ụzụ na-aṅaghị ntị ịnụ ihe ọbụla. Ụkwụ ya anaghị anọgide nʼụlọ ya. Ọ na-akwụgharị ma nʼokporoụzọ ma nʼama; na-amịgharị nʼebe nzuzo niile.) O weere aka ya abụọ jikụọ nwokorobịa ahụ nʼolu, sutu ya ọnụ, were ihu nke ihere na-adịghị, sị: “Emezuru m nkwa niile m kwere taa, enwekwara m nri nke sitere nʼihe aja udo m chụrụ nʼụlọ m, Ọ bụ gị ka m na-achọkwute, lee gị ka ị na-abịa. Agbasaala m akwa mara mma nʼelu ihe ndina m, bụ akwa ọcha mara mma tụrụ ọtụtụ agwa nke e ji ogho ndị Ijipt kpaa. Efesakwala m mmanụ isi ọma nke máá, aloos na sinamọn nʼelu nʼihe ndina m. Bịa, ka anyị were ịhụnanya ṅụjụbiga afọ anyị; ka anyị mee onwe anyị obi ụtọ site ugbu a ruo ụtụtụ echi. Nʼihi na di m anọghị nʼụlọ o jeela njem dị anya. O ji akpa ego juru gaa njem, abalị ole na ole ga-agafekwa tupu ọ lọta.”