ILU 7:1-5
ILU 7:1-5 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Na-agbaso okwu m nwa m, nọgide na ya, dokwaa iwu m niile nʼime obi gị. Debe iwu m ka ị dị ndụ, chee ozizi m nche dịka ọ bụ mkpụrụ anya gị. Kee ha na mkpịsịaka gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị. Hụ amamihe nʼanya dịka nwaagbọghọ ị hụrụ nʼanya; hụkwa inwe nghọta nʼanya dịka a ga-asị na ọ bụ nwanne gị. Kwee ka ha debe gị, ka ị ghara ijekwuru nwanyị na-akwa iko, ka ị gharakwa ịṅa ntị nʼokwu ire ụtọ ya.
ILU 7:1-5 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, debe okwu-ọnum nile, Zobe ihe nile m'nyere n'iwu n'ebe i nọ. Debe ihe nile m'nyere n'iwu, we di ndu, Debe kwa iwum dika nwa-anya nke anya-gi. Ke ha na nkpisi-aka-gi nile; De ha n'elu mbadamba nkume, bú obi-gi. Si amam-ihe, Nwa-nnem nwanyi ka i bu; Kpọ kwa nghọta nwanyi i mara nke-ọma: Ka ha we debe gi ka i pua n'aka nwanyi nābughi nwunye-gi, N'aka nwanyi nābughi nwunye-gi nke nēkwu okwu ire-utọ.