ILU 6:6-11
ILU 6:6-11 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Gaa mụta ihe site nʼaka ndanda, gị onye umengwụ. Mụta ihe site nʼụzọ ya niile. Ọ bụ ezie na o nweghị eze na-achịkọta ha, maọbụ onyendu, maọbụ ọchịagha, ma ọ na-akpakọta nri ya nʼoge ọkọchị ma na-ewebata nri ya nʼoge owuwe ihe ubi. Ọ bụ ruo ole mgbe ka ị ga-edina ala nʼebe ahụ, gị onye umengwụ? Olee mgbe ka ị ga-esi nʼụra bilie? Nwa ụra nta, nwa iru ụra nta, nwa ịchịkọba aka nta zuo ike, ụbịam ga-abịakwasị gị dịka onye ohi, ụkọ abịakwasịkwa gị dịka onye na-apụnara mmadụ ihe.
ILU 6:6-11 Bible Nso (IGBOB)
Jekuru ndanda, onye-ume-ngwu; Le uzọ-ya nile, we mara ihe: Nke nēnweghi onye-isi, ma-ọbu onye nēle anya n'ọlu, ma-ọbu onye nāchi achi, Ma ọ nēdozi nri-ya na mb͕e okpom-ọku, Nēkpokọta kwa ihe-oriri-ya na mb͕e owuwe-ihe-ubi. Rùe ole mb͕e ka i ganēdina ala, gi onye-ume-ngwu? Òle mb͕e ka i gēsi n'ura-gi bilie? Nwa ura ntà, nwa irù-ura ntà, Nwa ikpakọba-aka ntà idina ala; Ob͕eye-gi ewe bia dika onye nējeghari ipunara madu ihe, Ihe-ukọ-gi kwa dika nwoke ji ọta.