ILU 6:23-26
ILU 6:23-26 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ, idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi.
ILU 6:23-26 Bible Nso (IGBOB)
N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu: Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ, N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi. Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha: Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia.