ILU 6:20-29
ILU 6:20-29 Bible Nso (IGBOB)
Nwam, chebe ihe nna-gi nyere n'iwu, Arapu-kwa-la iwu nne-gi: Hie ha n'obi-gi mb͕e nile, Ke ha n'olu-gi. Mb͕e i nējeghari, ọ ganēdu gi; Mb͕e i nēdina ala, ọ ganēche gi; Mb͕e i teta-kwa-ra, nke ahu gēso gi kparia uka. N'ihi na oriọna ka ihe ahu enyere n'iwu bu; iwu ahu bu kwa ìhè; Ọ bu kwa uzọ ndu ka iba-nba nile nke idọ-aka-na-nti bu: Idebe gi ka i pua n'aka nwayi ọjọ, N'aka ire-utọ nke ire nwayi nābughi nwunye-gi. Achọsila ima-nma-ya ike n'obi-gi; Ekwe-kwa-la ka o were gi na mbubere-anya-ya. N'ihi na ọ bu n'ihi nwayi nākwa iko ka eji eme ka nwoke biarue nání otù ob͕e achicha: Nwunye nwoke ọzọ nāchu kwa ntá ndu di oké ọnu-ahia. Madu, ọ̀ gāguru ọku tiye n'uwe obi-ya, Ma uwe-ya agaghi-ere ọku? Ma-ọbu madu, ọ̀ gēje ije n'elu icheku-ọku, Ma ọku agaghi-aru ya n'ukwu-ya abua? Otú a ka onye nābakuru nwunye madu-ibe-ya di; Agaghi-agu onye ọ bula nke nēmetu nwayi ahu aka n'onye nēmeghi ihe ọjọ.
ILU 6:20-29 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Nwa m, debe ihe nna gị nyere gị nʼiwu, ahapụkwala iwu nke nne gị. Ka ndụmọdụ ha dịrị gị nʼobi mgbe niile, ka ị ghara ichefu ha. Mgbe ị na-ejegharị, ọ ga na-edu gị; mgbe ị na-arahụ ụra, ọ ga na-eche gị. Mgbe i tetakwara, ha ga-akpanyere gị ụka. Nʼihi na iwu a bụ oriọna, Ihe ozizi a bụkwa ìhè, otu a kwa ịdọ aka na ntị na ịba mba bụ ụzọ ezi ndụ, idebe gị ka ị pụọ nʼebe nwunye onye agbataobi gị nọ, sitekwa nʼire ụtọ nke nwanyị ọjọọ. Ekwela ka agụ nʼezighị ezi gụọ gị nʼime obi nʼihi ịma mma ya, ma ọ bụkwanụ ka o jiri ile anya ya rata gị. Nʼihi na nwanyị akwụna ka enwere ike iji otu ogbe achịcha nweta, ma nwunye nwoke ọzọ na-achụ nta ndụ gị ịla ya nʼiyi. Mmadụ ọ pụrụ ịgụrụ ọkụ tụkwasị nʼahụ ya, ma uwe ya ereghị ọkụ? Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ? Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya; o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ.