ILU 6:12-19
ILU 6:12-19 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Onye okwu na ụka na onye omume ya jọgburu onwe ya, onye na-ejegharị na-ekwu okwu aghụghọ, onye ji iro na-egbu ikuanya ya, jiri ụkwụ ya na-ekwu okwu na mkpịsịaka ya na-egosi ihe. Onye obi ya na-echepụta ihe ọjọọ na aghụghọ, onye na-akpalikwa esemokwu mgbe niile. Nʼihi ya, mbibi ga-abịakwasị ya na mberede; nʼotu ntabi anya ka a ga-ebibi ya, apụghịkwa ịgwọta ya. Ọ dị ụzọ ihe isii ONYENWE ANYị kpọrọ asị, e, ha dị asaa bụ ihe arụ nʼebe ọ nọ. Anya dị nganga, ire na-ekwu okwu ụgha, aka na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọjọọ. Obi na-echepụta nzube ọjọọ; ụkwụ na-eme ngwangwa ịgbaba nʼajọ ihe, onyeama ụgha na-awụpụ ụgha dịka mmiri na onye na-agbasa esemokwu nʼetiti ụmụnna.
ILU 6:12-19 Bible Nso (IGBOB)
Madu nke jọb͕uru onwe-ya, onye nēme ajọ ihe; O ji ọnu nke nēkwu ihe b͕agọrọ ab͕agọ ejeghari; O nēb͕u iku-anya-ya, o ji ukwu-ya abua ekwu okwu, O ji nkpisi-aka-ya nile nēzí ihe. Ib͕akuta Chineke azu di n'obi-ya, ọ nēchèputa ihe ọjọ na mb͕e nile: Ọ nēzisa ise-okwu. N'ihi nka nhuju-anya-ya gābia na mberede; N'otù ntabi-anya ka agētipia ya, ọ dighi kwa ngwọta di. Ihe isi di nke Jehova kpọrọ asì; E, ihe asa di nke bu ihe-árú nke nkpuru-obi-Ya: Anya di elu, na ire okwu-ugha, Na aka nāwusi ọbara nēmeghi ihe ọjọ; Na obi nke nēchèputa èchìchè ajọ ihe, Na ukwu nēme ngwa ib͕aga n'ihe ọjọ; Na onye-àmà okwu-ugha nke nēkupu okwu-ugha di iche iche dika ume, Na onye nēzisa ise-okwu n'etiti umu-nne.